AKỤKỌ ỤWA

NWANYỊ ỤMỤNEDE AHAPỤWO NWA YA DỊ AFỌ ATỌ N’ỤLỌ ỤKA GBALAGA

Asaba: Òtù nwata nwanyị ahapụwo obere nwa ya nwanyị dị sọọsọ afọ atọ n’ogige ụlọ ụka Katọliki nke Onye Nsọ Josef n’Akụmazi Umuocha nke dịdebere Ụmụnede na Delta Steeti were gbalaga.

N’okwu ọ gwara ndị nta akụkọ, Ụkọchukwu nọ ebe ahụ, Fada Pita Nwakwu kọwara na ya bụ ajọ akparamagwa wutere ya nke ukwuu maka nwa bụ onyinye si n’aka Chineke.

O kwuru na ya anọghị oge nwanyị ahụ kusara nwa ya n’ụlọ ụka ahụ gbalaga.

Kaosiladi, Fada Nwakwu sịrị gara ozigbo gaa kpesara ụlọ ọrụ ndị Uwe Ojii nọ n’Ụmụnede, ndị dinyeziri ótù onye Uwe Ojii, onye ya na ya soro kpọga nwatakịrị ahụ n’ogige nlekọta ụmụ enwe nne, enwe nna (orphanage) n’Asaba.

Show More

Related Articles

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *

Back to top button
Close
Close