AKỤKỌ ỤWA

NWATAKỊRỊ NWOKE UGHELLI EJIRIWO MMA GBUJAA NNA YA KA AGWỌ OGE Ọ NỌ N’ỤRA

  •  

    Wọrị – Ebelebe gburu n’Okpare dị n’Olomu nọ n’Okpuru Ọchịchị Ndịda Ughelli na Steeti Delta n’isi ụtụtụ Wenezdee, oge e nwetara ozi etu nwata nwoke dị afọ iri abụọ na asatọ siri were mma gbujaa nna ya bụ Ụkọchukwu ndi ụka Angịlịkaanụ, oge ọ nọ n’ụra

    Nwokorọbịa ahụ bụ Ufuoma Umurie wakporo nna ya , Ụkọchukwu Isaac Umurie, onye nọ n’ụlọ ụka Angịlịkaanụ nke Onye Nsọ Jọn, Okpare-Olomu, n’ebe elekere abụọ nke isi ụtụtụ, wee jiri mma gbuo ya ka agwọ.

    Sọọsọ Chineke zọpụtara nne ya, onye ọ chọkwuru igbu n’aka ya, oge nwaanyị riri mbọ mbọ ọsọ.

    Ufuoma, onye nọ n’aka ndi Uweojii ugbua, ka a sị na o ji mma òbèjì were wakpo nna na arahụ ụra, gburie ya okporo isi ma gburikọọ ákụkụ ahụ ya ndị ọzọ.

    hoo!haa!! nwetakwara ozi ya bụ nwata nwoke bụ onye isi ezubughi oke, na nke ahụ bụ ugboro abụọ ọ na-awakpo nna ya etu ahụ.

    Otu onye obodo ahụ kwuru sị, “Nkea abụghị mbụ o si etu a awakpo nna ya. Oge nke ọzọ, o tiri ya gwoo gwoo. Ndi nche ógbè Okpare-Olomu jidere ya mana nna ya rịọrọ ka a hapụ ịkpụga ya n’ụlọ ọrụ ndị Uweojii. Anyị nụkwara na isi ezuchaghị oke.

    Ọnụ na-ekwuru Ndi Uweojii, Ngalaba Steeti ahụ, SP Bright Edafe, kwuru na ya bụ nwokorọbịa nọ n’aka ha. O kwuru na a ga-akpụpụ ya ije kpee ya ikpe maka anụ

    Show More

    Related Articles

    Leave a Reply

    Your email address will not be published. Required fields are marked *

    Back to top button
    Close
    Close