NWOKE ABAGANA AKPỌWO NWUNYE YA ỌKỤ MAKA ỊGBA N’IRO



Ọka – Ótù nwata nwoke, Mazị Nwanna, onye Abagana dị n’Okpuru Ọchịchị Njikọka na Steeti Anambara ka hoo!haa!! nwetara ozi na ọ kpọrọ nwunye ya ọkụ maka ebubo ịgba n’iro, ụbọchị Tuzdee n’Eziezekwe, Abagana.
Kaosiladị, ya bụ onye e mere ihe(victim), Chiọma Nwana, onye ji ụmụ isii, nọzị n’ụlọ ọgwụ nwụọ site na ya bụ ọkụ ọ́gbụgba, n’ụtụtụ ụbọchị taa bụ Wenezdee.
Ya bụ nwaamadị jiri aka ya gaa ụlọ ọrụ ndi Uweojii Mpaghara Abagana, nyefee onwe ya n’aka ha, ka o mechara ihe o mere.
Ka nwaanyị ahụ gachara bata n’abalị ụbọchị ahụ, di ya boro ya ebubo akwamiko mere ha jiri nwewe esemokwu. Nwanna buteziri mmanụ ọkụ, wụọ nwunye ya ma mụnye ya ọkụ.
O kwuru na iwe ya bụ na ụmụ nwoke ndi ahụ dinara nwunye ya zutere ya n’ụzọ na-akparị ya
Ọnụnaekwuru ndi Uweojii na Steeti Anambara, Ikenga Tochukwu kwuru na Kọmishọna ndi Uweojii na steeti ahụ, Indaghe enyewo ntuziaka ka ngalaba okwu ọ́chụ̀ malite nnyocha banyere okwu ahụ.