AKỤKỌ ỤWA
NWOKE AGEGE AKWỤGBUWO ONWE YA
Legọs – Nwata nwoke Agege, Legọs, aha ya bụ Benjamin akwụgbuwo onwe ya.
Ozi si n’aka Ọnụ na-ekwuru Ndi Uweojii Steeti Legọs, SP Benjamin Hundeyin, kwuru na ya bụ nwaamadị dị afọ iri ise na anọ kwụgburu onwe ya n’ebe elekere asatọ nke abalị ụbọchị ụka gara aga.
O kwuru na nwanne ya nwoke tọrọ ya wetara ajọ ozi ahụ n’Ụlọọrụ Ndi Uweojii n’Elere, Agege.
“Ndi Uweojii bịazịrị butuo ozu ya, buga ya n’ụlọ ọ́gwụ̀ Orile-Agege, ebe e kwupụtara na ọ nwụọlarịị”
Chai! Nsogbu ụwa akarịwo mana mmadụ igbu onwe ya akaghị mma.