AKỤKỌ ỤWA

NWOKE ASỤGBUOLA NWUNYE YA MAKA EBUBO ỊGBA N’IRO

Abiokuta: N’Ogun Steeti, aka ndị Uwe Ojii akparala ótù nwaamadị, Sobola Olatunji, onye dị afọ iri anọ n’isii maka iji mma sụgbuo nwunye ya, Momudat Sobola maka ebubo ịgba n’iro.

Olatunji, onye na-arụ ọrụ n’Okpuru Ọchịchị Remo dị na Steeti ahụ bidoro ibo nwunye ya ebubo ịgba n’iro ka ọ gụchara edemede ekwentị dị n’ekwentị nwanyị ahụ.

Nkea butere ha abụọ esemokwu mere ha jiri lụwa ọgụ. Ọ sụzịrị nwunye ya mma ugboro ugboro n’azụ nke butere ọnwụ ya.

DSP Abimbola Oyeyemi, Ọnụ na-ekwuru Ndị Uwe Ojii na Steeti ahụ kwuru na ọ bụ nna nwunye ya ahụ, Alahaji Ambali Yinusa bụ onye bịara weta mkpesa n’ụlọ ọrụ ndị Uwe Ojii nọ n’Owode- Egba, na ọgọ ya nwoke asụgbuola ada ya nwanyị.

Show More

Related Articles

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *

Back to top button
Close
Close