AKỤKỌ ỤWA
NWOKE ASỤGBUOLA NWANNE YA BỊARA ÍGBÒ ỌGỤ YA NA NWUNYE YA


Wọrị: Ótù nwata nwoke ejirila mma sụgbuo nwanne ya nwoke, Daniel Agboyikolo, onye bịara idozi esemokwu dị n’etiti ya na nwunye ya n’Ughoton dị n’Okpuru Ọchịchị Okpe, ụbọchị Mọnde.
Ọ bụzị ka ọ na-egbo ọgụ di na nwunye ahụ ka nwanne ya nwoke jiri sụta ya mma.
Nwoke onye ajọ chi ahụ nwụnyụrụ anya tupu e rute ụlọ ọgwụ.
Ọnụ na-ekwuru Ndị Uwe Ojii na Steeti ahụ SP Onome Onovwakpoyeya, kwuru na ndị Uwe Ojii ka na-achọ ya bụ nwoke, onye gbalagara ka ọ hụrụ na nwanne ya nwoke anwụọla.