NWOKE BENUWE AKPỌỌLA ONWE YA NA ENYI YA NWANYỊ JỤRỤ ỊLỤ YA ỌKỤ


Makurdi: Òtù nwoke dị iri afọ anọ Nicodemus Nomyange, nọrọ ụbọchị Satọdee were kpọọ onwe ya na enyi ya nwanyị Shiwasingi Pam, onye jụrụ ịlụ ya ọkụ.
Nomyange, onye a sịrị lụrụ nwanyị mụtakwa ụmụaka chọrọ ka Nwa-ada ahụ bụrụ nwunye ya nke abụọ. Ndị enyi Shiwasingi nyere ya ndụmọdụ ka ọ ghara ikweta ịbụ nwanyị nke abụọ.
N’uhuruchi ụbọchị ahụ, ka Nomyange bu “gallon” mmanụ ụgbọala bịa n’ụlọ enyi ya nwanyị ahụ, ndị agbata obi chere na ọ chọrọ ịgbanye ya n’ígwè ọkụ (generator).
Kaosiladi, nwoke ahụ kpọchiri ụzọ ma mụnye ọkụ n’ụlọ ahụ dị n’Okporo Ụzọ Inikpi n’ógbè High Level, Makurdi nke ọ kwụrụ ụgwọ ya ma chọkwaa mma site na ịkwanye ya ngwa nile e ji ebi n’ụlọ.
Ọkụ ahụ gbagburu ha abụọ tupu ndị ọrụ Ntinyụ Ọkụ erute.
Ọnụ na-ekwuru Ndị Uwe Ojii na Steeti ahụ, DSP Kate Anene kwuru na ndị Uwe Ojii na Steeti ahụ na-eme nnyocha banyere okwu ahụ.