NWOKE CHỌZỊRỊ ỊGBA NWUNYE YA ALỤKWAGHỊM, NA OKE MMA YA MEZIRI KA OBI GHARA IRU YA ALA



Ótù nwaamadị arịọwo ụlọikpe ka ọ gbaa nwunye ya alụkwaghịm maka na oke mma nwanyị ahụ mara meziri ka obi ghara iru ya ala.
Arnold Masuka, onye dị afọ iri anọ wetara mgbagwoju anya nye mmadụ niile nọ n’ụlọikpe ahụ dị na Lusaka, mba Zambịya oge o gwara Ọkaikpe na udiri mma nwunye ya, Hilda Mleya mara mere na ụra gwụrụ ya n’anya, na mkpụrụ obi ya anaghịkwa enwe ezumike maka na ụjọ ji ya na ụmụ nwoke ndị ọzọ ga-anara ya agbọmma nwunye ya.
Nwaamadị kwuru na nke ka nke bụ na ya anaghi aganwuzi ọrụ ma ọ bụkwanụ hapụ nwunye ya ahụ sọọsọ ya anọrọ maka ụjọ ụmụ nwoke ndị ọzọ ịgbaji ya aka, napụ ya ya.
Kaosiladi, Mazị Chenjerai Chireya, Odeakwụkwọ Ụlọikpe ahụ kwuru na ya ahụbeghi udiri okwu ahụ mbụ ma rịọkwaa ka ezinụlọ nke nwoke na nke nwaanyị leba anya n’okwu ahụ.
Hmmmm, “ỤWA EZU OKE”. Onye nọrọ ebe ọ nọ, ebe ọ nọghị a na-agụ ya.