AKỤKỌ ỤWA

NWOKE EBERELA ISI NWUNYE YA BUGA ỤLỌ ỌRỤ NDỊ UWE OJII MAKA AKWAMIKO

Na Baberu dị na Steeti Uttar Pradesh, Ịndịya, ótù nwaamadị, Chinnar Yadav eberela nwunye ya bụ Vimla isi, sekpụrụ ya na ntụtụ isi ka ọ bara na-asọpụta, soro okporo ụzọ bata n’ụlọ ọrụ ndị Uwe Ojii ụbọchị Fraịdee.

Site n’okwu ASP Mahendra Pratap Chauhan: “Ka ha nwechara esemokwu kpụ ọkụ n’ọnụ, onye a ana-ebo ebubo jiri ngwa ọgụ wakpo nwunye, gbuo ya ma bekwaa ya isi.

“O buzi isi nwunye ya bịa nyefee onwe ya n’aka ndị Uwe Ojii n’ụlọ ọrụ ndị Uwe Ojii”

O kkwukwara na nnyocha na – agazi n’ihu maka okwu ahụ.

Show More

Related Articles

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *

Back to top button
Close
Close