AKỤKỌ ỤWA

NWOKE EBEWAALA NWUNYE YA AFỌ ỊMA MA Ọ BỤ NWA NWOKE KA Ọ DỊ IME YA

Ótù nwoke dị afọ iri anọ n’atọ nwunye ya mụbuworo ụmụaka nwanyị ise ebewaala nwunye ya dị ime afọ ịma ma ọ bụ nwa nwoke ka ọ dị ime ya na mba Ịndịya.

Pannalal wakporo nwunye ya Anita Devi n’abalị Satọdee na be ha dị na Mpaghara Budaun, were hapụ ya n’ime ọbara na-asọsịsị ya n’ahụ.

Ezinụlọ Anita gwara ndị Uwe Ojii na di ya bewara ya afọ iji mata ma nwa dị ya n’afọ abụ nwoke ka ọ bụ nwanyị.

Di ya kwuru na ya mere ya n’amaghị ama, na ihe o ji bụ ụmụaka ụmụ nwanyị ise.

N’agbanyeghị na nwa ahụ nọ n’afọ emerụghi ahụ, ọnọdụ ahụike Anita gbadara maka nnukwu mmerụ ahụ o nwere.

Ozi si n’akwụkwọ akụkọ Times of India.com, kwuru na ndị Uwe Ojii kpọgara nwanyị n’ụlọ ọgwụ na Safdarjung.

Show More

Related Articles

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *

Back to top button
Close
Close