AKỤKỌ ỤWA

NWOKE EDO ETIGBUOLA NWUNYE YA MAKA ỊNAHA YA INWE MMEKỌAHỤ

Bini: Aka ndị Uwe Ojii Ngalaba Edo Steeti akparala ótù nwoke dị afọ iri ise, tigidere nwunye ya ihe tigbuo ya maka na ọ nahara ya inwe mmekọahụ.

Ọnụ na-ekwuru ndị Uwe Ojii na steeti ahụ, Kontongs kwuru na ọdachi ha dapụtara n’ịdị ụtụtụ abalị iri abụọ n’asatọ nke ọnwa Juun afọ a.

“Nwoke ahụ mụtara ụmụ abụọ bịakwutere nwunye n’ebe elekere iri n’otu n’ime abalị, n’abalị iri abụọ n’asaa nke ọnwa Juun afọ a ka ha nwee mmekọahụ. Nwanyị ahụ jụrụ nke mere o ji tiwe ya ihe,were meruchaa ya ahụ.

“E buru ya gbaga ụlọ ọgwụ anọ, ndị jụrụ ịnabata ya. E bugazịrị ya n’ụlọ ọgwụ UBTH, ebe ọ nọrọ nwụọ n’abalị asaa nke ọnwa Julaị afọ a”

Show More

Related Articles

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *

Back to top button
Close
Close