AKỤKỌ ỤWA

NWOKE JI ỤKWỤ SI GOMBE GAA ABỤJA NA MMERI BUHARỊ N’AFỌ 2015 WERE DAA N’ỌRỊA ENWETALA ỤGBỌALA N’AKA GỌVANỌ YA

Gombe: Gọvanọ Gombe Steeti, Alhaji Inuwa Yahaya, enyela Mazị Dahiru Buba, nwoke dị afọ iri ise, onye dara n’ọrịa ka o ji ụkwụ si Gombe gachaa Abụja iji ṅụrịa na mmeri Onyeisiala Muhammadu Buharị n’afọ 2015, onyinye ụgbọala na ego dị Nde Naira abụọ.

Nkea bụ ka akwụkwọ akụkọ Punch buchara akụkọ banyere nwoke ahụ, onye na-akwa arịrị na a na-achịzị ya ọchị, na o zuzuru ezuzu site na iji ụkwụ gaa ije ahụ were ya abalị iri n’ise.

Kaoditaa, ya bụ nwoke “o ji ụkwụ eje Aba” na – anara ị ọgwụgwọ maka ọrịa ahụ o butere ka ọ gbachara ogologo ije ahụ.

Ụgbọala e bunyere nwoke ahụ aka ọrụ ya bụ ịnya ụgbọala bụ ụgbọala Space wagon.

Hmm, nke ahụ bụ nke nwoke jetere onwe ya n’ụkwụ.

Show More

Related Articles

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *

Back to top button
Close
Close