AKỤKỌ ỤWA
NWOKE KANO EGBUOLA NWA YA NWOKE MAKA OHI MMANỤ NRI


Kano: Ótù nwoke, Awaisu Nagyala, etigbunyụọla nwa ya nwoke, Abba Awaisu, onye dị afọ iri n’asatọ ụbọchị Tuuzdeena Gwazaye dị n’Okpuru Ọchịchị Kumbotso na Kano Steeti.
Nwoke ahụ kpọchibidoro nwa ya ahụ, o boro ebubo izu “gallon” mmanụ nri ya abụọ, n’ime ụlọ were okporo osisi kugide ya kụgbuo ya.
Ótù onye akaebe, Kabiru Usman, kwuru na nwoke ahụ gwara ndị agbata obi ndị bịara ịzọ nwatakịrị ahụ ka ha ghara itinye aka n’ezinụlọ ya.
E bugara nwatakịrị ahụ n’ụlọ ọgwụ, ebe ọ nọrọ nwụọ.
Ọnụ na-ekwuru Ndị Uwe Ojii na Steeti ahụ, DSP Abdullahi Haruna, kwuru na ọ nụbeghi banyere ya.