AKỤKỌ ỤWA

NWOKE NSỤKA EBEELARA ỤLỌIKPE AKWA ARỊRỊ NA NWUNYE YA NA-AKỤ YA KA Ọ KỤGBUO


Legọs – Mazị Edwiini Ugwu, onye Nsụka, Enugwu Steeti ewerela anya mmiri kọọrọ ụlọikpe Majie nọ n’Ọ́gbà, Ikeja etu nwunye ya ọ hụrụ n’anya bụ Ebere si eti ya ihe ka o tigbunyụọ ya anya, oge ọbụla ha nwere obere nghọtahie.

DSP Kehinde Ajayi, onye ji okwu ahụ, gwara ụlọikpe Majie ahụ na di na nwunye ahụ bi n’Okporo ụzọ Lambe Iluyomade, Ago Okota, Legọs nwere nghọtahie nke butere esemokwu meziri na nwaanyị ahụ tiri di ya gwoo gwoo ma kpụkwaa ya ka ndị Ọ́ká si akpụ ụzụ.

Ọ sịrị na nwaamadị ahụ, onye dị afọ iri ise na isii nwetazịrị onwe ya n’ụlọ ọ́gwụ̀, ebe ọ nọrọ abalị ole na ole were gbakee.

Kaosiladi, nwaanyị “Akpụ Obi” ahụ gwara ụlọikpe Majie ahụ na ikpe amaghị ya maka ebubo iti di ya ihe nakwa imerụ ya ahụ.

Majie E. Kubenije, nyeziri ntụziaka ka e jiri Ótù Narị Puku Naira nara nwaanyị ahụ n’akaebe ụlọikpe ma higharịkwa ikpe ahụ n’abalị isii nke ọnwa Juun

Hmmm, akụkọ nke a nwekwara ka ọ dị maka na “Okeke nwanyị dị ntị njọ”. Kedu ihe kara nwoke a obi, o ji lụọ nwanyị ka ya ike. Ọ bụ ịhụnanya?

Show More

Related Articles

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *

Back to top button
Close
Close