Uncategorized

NWOKE OGBOMOSHO ATỌGBUWO ÍKÒ YA

Ibadan: Ụlọ ọrụ ndị Uwe Ojii ngalaba Ọyọ Steeti anwụchikọwo ótù nwaamadị dị afọ iri ise, Joshua Oyebode, maka ịtọgbu Bukọla Ajala, íkò ya, onye nke nke dị afọ iri abụọ na abụọ n’Ogbomoso dị na steeti ahụ

Ọnụ na-ekwuru Ndị Uwe Ojii na steeti ahụ, SP Adewale Osifeso, kwuru na ya bụ nwaamadị jiri aghụghọ rata ya bụ nwa agbọghọ ma tọgbọ ya.

O kwuru sị, “N’abalị iri abụọ nke ọnwa Nọvemba, n’ebe elekere iri abụọ nke ehihie, anyị nwetara mkpesa n’ụlọ ọrụ ndị Uwe Ojii nọ n’Owode-Ogbomosho site n’aka ótù nwaamadị bụ Ịmanụwelụ Ajala banyere ọnwụ nwa ya nwanyị.

“Nnyocha anyị mere gosiri na n’abalị iri na itoolu nke ọnwa Nọvemba, n’ebe elekere iri nke ụtụtụ, na ya bụ onye a na-ebo ebubo ratatara ya bụ onye laworo mmụọ, raga ya ebe dịpụrụ adịpụ, were tọgbuo ya. Ụjọ tụwara ya na nwa agbọghọ ahụ nwere ike ikwupụta ọgbụgba ndụ ha gbara nakwa ndụ akwamiko ha, oge ọbakwutere ya n’ụlọ ka ọ na-akwakọ ngwo ngwo ya.

Osifeso kwukwara na ya bụ onye a na-ebo ebubo ekwupụtawo ya bụ arụ ọ kpara

Show More

Related Articles

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *

Back to top button
Close
Close