NWOKE ỌNỊCHA EJIRIWO KARAMA SỤGBUO NWANNE YA NWOKE



Ọnịcha – Ndi Uweojii Ngalaba Steeti Anambara anwuchikọwo otu nwata nwoke, Christian Ndụbụisi, onye ji mpekere karama sụgbuo nwanne ya nwoke tọrọ ya oge ha nwere obere nghọtahie na mpaghara 3-3, Ọnịcha.
Ozi si n’aka Ọnụ na-ekwuru ndi Uweojii na steeti ahụ, SP Tochukwu Ikenga, kwuru na ndi Uweojii si mpaghara 3-3 jidere ya bụ ajọ nwanne ụnyaahụ bụ Satọdee, abalị iri na ise nke ọnwa Febrụarị afọ 2025.
Ikenga kwuru sị, “Ozi anyi nwetaworo na ya bụ nwoke laworo mụọ na nwanne ya na -enwe nghọtahie, oge onye ahụ a na-ebo ebubo jiri kụwaa karama were sụọ nwanne ya nwoke.
“E jiri ọsọ buga ya ụlọ ọgwụ ebe dọkịnta kwuziri na o kubiela.”
O kwukwara na Kọmishọna ndi Uweojii steeti ahụ, CP Ikioye Orutugu, fwc MNIPS PhD, ji ohere ahụ nye adọmakanantị maka iji iwe ọkụ emebi ihe.
O nyekwara ntuziaka ka ewega okwu ahụ n’isi Ụlọ ọrụ ndi Uweojii steeti ahụ, Ngalaba Nnyocha n’Ọka.
Chai! Iwe ọkụ ajọka. Gịnị mere mmadụ ga-eji sụgbuo nwanne ya? Nke a jọgburu udele, sigbuo nkakwụ