NWOKE ỌNỊCHA ESILA N’ỤLỌ ELU NKWÀGÓ ISE KWATUO ENYI YA NWANYỊ


Ọnịcha: Aka ndị Uwe Ojii akparala ótù nwaamadị, Nọnso Eze, onye dị afọ iri atọ n’asaa maka ọnwụ enyi ya nwanyị dị afọ iri abụọ n’atọ onye o si n’ụlọ elu dị nkwàgó ise were kwatuo ka ha nwere nghọtahie.
Ọnụ na-ekwuru Ndị Uwe Ojii na Steeti ahụ, Haruna Mohammed, kwuru na ozu nwa agbọghọ nọzị n’ọba ozu, na ha ga-ewe ga okwu ahụ n’ụlọikpe ma ha mechaa nnyocha ha.
“Ụlọ ọrụ ndị Uwe Ojii nọ n’Awada nwetara mkpesa na n’ebe elekere atọ nke isi ụtụtụ na ótù nwa agbọghọ ana amaghị aha ya si n’elu nkwàgó nke ise ụlọ elu nọ na No. 6 Orakwe Close, Awada Obosi n’Okpuru Ọchịchị Mgbago Ugwu Idemili n’Anambara Steeti wee daa.
“Ndi Uwe kpọgara ya ụlọ ọgwụ Bex, Ọnịcha ebe dibịa oyibo nọrọ kwuo na ọ nwụọlarịị.
“Ndi Uwe Ojii bịa ịrị kpụrụ ya bụ nwata nwoke onye kwaturu ya”