AKỤKỌ ỤWA
NWOKE ỌNỊCHA NWUNYE YA MỤRỤ EJIMA ATỌ AGBALAGAWO


Ọnịcha: Sunday Odinaka, onye nwunye ya mụrụ ejima atọ ahapụwo nwunye ya, Evelyn n’ụlọ ọgwụ dị n’Okporo, n’Okpuru Ọchịchị Ogbaru were gbalaga maka ụgwọ Narị puku Naira Anọ n’iri ise (N450, 000) o kwesịrị ịkwụ ndị Ụlọ ọgwụ ahụ.
Evelyn gwara ndị nta akụkọ na ha jibu ụmụ anọ tupu oge a.
“Tupu m mụọ nwa, o nweghị ihe dị n’ụlọ anyị na-eri. Ihe m na-ere bụ mmiri oyi (satchet water).
“Ozigbo ndị Ụlọ ọgwụ gwara ya ego ole ọ ga-akwụ, o gbalaga”