ASỊRỊ

NWOKE ORILE HAPỤRỤ NWA NWUNYE YA MỤRỤ N’ỤLỌ Ọ́GWỤ̀ NA Ọ JỌKA

Legọs: Ótù nwata nwoke, onye Mbaise bi n’Orile, Legọs ka hoo!haa!! nụrụ na ọ hapụrụ nwunye ya na nwa ọhụrụ ọ mụrụ n’ụlọ ọgwụ, gasie ike.

Mazị Esomeọnụwa Chilaka, onye na-azụ ahịa n’Alaba Sụrụ kwuru na ihe bụ iwe ya bụ na nwatakịrị ahụ jọrọ oke njọ, na o yighi ya chaa chaa.

Ọ gwara nwunye ya sị, “Ị ga-agwa m onye nwe nwa ị mụrụ maka na ọ bụghị m nwe.

“O nweghị onye o yiri n’ezinụlọ anyị ma ọ bụkwanụ na nke unu.

“Lee, ndị be anyị na ndị be unu nwechara ogologo imi. Obosara imi nwata nke a, o si ebe ole?”

Nwanyị mmadụ azabeghi ajụjụ ahụ ruo ugbua.

Show More

Related Articles

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *

Back to top button
Close
Close