Uncategorized

NWOKE PLATEAU STEETI EJIRIWO AKAODO KỤGBUO NNA YA

Jọs – Ndi Uweojii Ngalaba Plateau Steeti anwụchikọwo ótù nwaamadị, Josefụ Yakubu, dị afọ iri abụọ na itoolu, onye acna-ebo ebubo iji akaodo kụgbuo nna ya Yakubu Dalyop.

Ọdachi ahụ dapụtara n’obodo Anglo-Jos dị n’Okpuru Ọchịchị Ndịda Jọs, oge ha abụọ nwere nghọtahie.

Kọmishọna ndi Uweojii na steeti ahụ, Hassan Yabanet, kwupụtara ya bụ nwaamadị na ndị ọzọ e boro ebubo maka mpụ́ dị iche iche n’ihu ọhaneze ụbọchị Tuuzdee.

“Josefụ Yakubu, dị afọ iri abụọ na itoolu nọrọ n’ebe elekere asatọ, n’abalị iri na ise nke ọnwa Febrụwarị afọ a na Kambel, Anglo-Jos were kụọ nna ya, Yakubu Dalyop, dị afọ iri anọ na itoolu akaodo n’isi

Ọ kọwara na Josefụ kụrụ nna ya akaodo n’isi ka ha nwere obere nghọtahie n’ebe elekere asatọ, n’abalị iri na ise nke ọnwa Febrụwarị afọ a.

O kwuru na nwoke na e buru nwoke ahụ gbaga ụlọ ọgwụ Plateau State Teaching Hospital oge o koropuru bụ ebe ọ nọzị nwụọ ka abalị anọ gachara.

Yabanet kwukwara na ka o lebachara anya n’ọnọdụ nchekwa na steeti, o wepụtara atụmatụ nchekwa ọhụrụ nke ga-enyere ndị ọrụ ya aka ịnwuchikọ ndi omekome n’agbanyeghị n’ime ọnụ ọbụla ha zokpuru onwe ha na steeti ahụ.

Hmmmm! Tụfiakwa! Nwata nwoke a, afọ tara ya mmiri. Kedu nke bụ iji akaodo kụgbuo nna ya?

Show More

Related Articles

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *

Back to top button
Close
Close