AKỤKỌ ỤWA

NWOKORỌBỊA EJIRIWO MMA GBUO ENYI YA NWANYỊ MAKA ỊKỤRI EKWENTỊ IPHONE YA

Wọrị: Ótù nwata nwokorọbịa, Godspower Adegheji nke Etevie, Ozoro dị na Wọrị, onye dị afọ iri abụọ na atọ ejiriwo mma obeji gbuo enyi ya nwaanyị maka ịkụri ekwentị IPhone 11pro max ya dị oke ọnụ.

Adegheji gburu enyi ya nwaanyị bụ Gift Oloku, onye dị afọ iri abụọ na abụọ maka na ọ pụrụ apụ n’agwaghị ya ebe ọ na-aga.

Ya bụ nwa agbọghọ laworo mmụọ kụriri ya bụ ekwentị ahụ n’amaghị ama oge ha na – alụ ọgụ.

Nke a meziri ka oke iwe jupụta Adegheji n’obi mere o ji kpụrụ mma obeji were gbunyụọ ya anya.

DSP Bright Edafe, ọnụ na-ekwuru ndị Uwe Ojii na Delta Steeti kwuru nke a n’ozi ya na Twitter.

Ọ kọwara na ya bụ nwaamadị nọzị na nga.

Tụfịakwa! Ụmụ ọgwụgwụ ofe, kedu ihe gbasara ndị na-eto eto dị afọ ole dị etu a na ime enyi nakwa ịzụ ụdịri ekwentị dị oke ọnụ ka I Phone 11 Pro Max oge ha kwesịrị ịnọ na Mahadum dịka ụmụ akwụkwọ?

Show More

Related Articles

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *

Back to top button
Close
Close