AKỤKỌ ỤWA

NWORIE, ONYE NWERE NZERE MMỤTA “1ST CLASS” NỌ NA-ÁKỌ̀ ỤGBỌ ENWETALA OHERE IME PH. D N’AMERỊKA N’EFU N’AKA ONYE YOROBA

Abakiliki: Chineke echetawo Mazị Ịmanụwel Chinweụba Nworie, onye akụkọ ya wusara na Twitter nakwa ọbaozi mmekọrịta ndị ọzọ ebe ụbịam mere ka ya bụ nwaamadị tọgbọ asambodo Nzere Mmụta ógó nke mbụ (1st Class) o nwere na Ngalaba Mgbakọ na Mwepụ (Mathematics) na Mahadum Naịjiriya, Nsụka (UNN) were bụrụ ọgụ kọwa ugbo.

Ótù nwaamadị onye Yoroba, Dọkịnta Busayo Aworunse bụ onye Chineke zitere iji nụrụ mkpu ákwá ya site n’atụmatụ Agụmakwụkwọ n’efu bụ Michael Taiwo (MT) Scholarship.

O so n’ime mmadụ iri abụọ n’atọ ndị gafere n’ule inweta ohere agụmakwụkwọ n’efu ahụ n’ime mmadụ ótù puku na narị ise n’itoolu lelere ule ahụ.

Nworie, nwa-afọ Abakiliki, Ebonyi Steeti, onye dị afọ iri abụọ n’asaa kpara ike dị egwu site na inweta Mkpokọta Akara 4.92/5.00 n’agụmakwụkwọ mana ọ husiri anya ịzụ onwe ya n’akwụkwọ, ka nna ya nwụrụ n’afọ 2005.

Ozi hoo!haa!! nwetara bụ na mahadum atọ na mba Amerịka gụnyere Southern Methodist University, the University of Tennessee, Knoxville nakwa the University of Texas, Dallas nyere ya ohere agụmakwụkwọ n’efu, ebe ọ họọrọ Southern Methodist University, Dallas, Texas.

Ka Okuke Abịama Chi Ndigbo gọzie Dọkịnta Busayo Aworunse maka ọ̀gọ̀ a o meere nw’ogbenye. Ọzọkwa, ọ bụrụ na Nworie etinyeghi onyonyoo ya, ebe ọ nọ n’Abakiliki akọ ugbo na Twitter, ụwa agaghị ama ihe ji ya. Ọbaozi mmekọrịta bakwara uru.

Show More

Related Articles

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *

Back to top button
Close
Close