AKỤKỌ ỤWA

NYSC EDUWO NDI KỌPA ENUGWU 1,200 N’IYI ỌRỤ

Ọ̀gwụ̀ – Ụlọ ọrụ National Youths Service Corps (NYSC), nọrọ ụbọchị Fraịdee n’ogige ọ̀zụ̀zụ̀ ha dị n:Ọ̀gwụ̀, Steeti Enugwu were duo ndi kọpa dị otu puku na narị abụọ (1,200) n’iyi ọrụ dịka ndi nkeji nke ‘Ch’ maka iji ótú afọ fee ala nna ha.

N’okwu ya oge ahụ, onye Nlekọta NYSC na steeti ahụ, Oriakụ Oluwakemi Oluwola, kwuru na ụmụ nwoke dị 569, ebe ụmụ nwaanyị dị 631.

O nyekwara ha ndụmọdụ ka ha na edebe iwu nile nke ogige ọ̀zụ̀zụ̀ ahụ na esonyekwa n’ihe nile a na-eme ebe ahụ.

Ọ kọwara na ihe a ga-ekuzi ha gụnyere ọ̀zụ̀zụ̀ ndi agha, nkuzi ịbụ ezigbo nwa amaala na onye ndụ, ịmụta asụsụ, ịmụta akaọrụ, wdg.

O tokwara Gọvanọ Peter Mbah maka iweta nde Naira ise N5M, e ji gwuo ụ̀mị̀ ndọ́rọ́ mmiri (borehole) nke abụọ ebe ahụ. Oluwola kelekwara Aka na-achị steeti ahụ maka ịhụ na eweghachitere ọkụ latrik nke Gọọmenti ebe ahụ.

O kelekwara Onyeisioche Okpuru Ọchịchị Ọ̀gwụ̀, Mazị Uche Okolo, maka ị́kwà ụzọ e si abata n’ogige ahụ.

N’okwu ya, Gọvanọ Mbah, onye nke Kọmishọna maka Ndi Ntorọbịa na Egwuregwu, Ọkaiwu Lloyd Ekweremadu nọchitere anya ya,nabatara ndi kọpa ahụ ma kwekwa nkwa ịrụ ihe ndi nile kwesịrị ekwesị n’ogige ahụ iji hụ na ndi kọpa ahụ enweghi nsogbu ọbụla.

Show More

Related Articles

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *

Back to top button
Close
Close