ASỊRỊ

Ọ BỤ MERCY EKE NA-ESERE OBI CUBANA NA CUBANA CHIEF PRIEST?

Owere: Gịnị na-esere Obi Cubana, onyenwe ụlọ egwu awantịlọ Cubana na onye nlekọta ụlọ ọrụ ya, Cubana Chief Priest?

Nkea bụ ajụjụ onye ọbụla na-ajụ kemgbe ezi ọyị abụọ a seziri okwu enwe mmekwata.

Kaosiladi, Kepu Kepu hoo!haa!! na-anụ na-egosi na o nwere ike bụrụ ásá na – esere ha okwu.

‌Ásá ahụ bụ onye a kpụ n’ọnụ bụ Mercy Eke,
onye tuuru ugo n’asọmmpi BBNaija afọ gara aga.

Mmekọ Mercy na Cubana Chief Priest bidoro iwusa ebe nile na ngwụcha afọ gara aga.

Ọkụ elu (slay Queen) dịka Mercy Eke bụ ọkụ na – eri ego. Ọ pụtara na Obi Cubana were na Cubana Chief Priest ji ego ya agba alabanko, ya na Mercy Eke?

Cubana Chief Priest amalitewo ụlọ egwu awantịlọ nke ya n’Owere a na-akpọ De Angels.

“A gbaala mbọ ma rụkwaa ọrụ n’adịghị nchefu. E toruola m ibido nke m”

“Nwata ịka nna ya abụghị njọ. Kedu ihe mere ọpụpụ m ji esezi okwu?”

Show More

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *

Back to top button
Close
Close