AKỤKỌ ỤWA

ỌBARA NDỊ SOJA GBURU N’Ọ̀LỤ́ DỊ GỌVANỌ ỤZỌDỊMMA N’ISI – “ỌHANAEZE”

Enugwu: Òtù Ọhanaeze Ndigbo nke Ichie Omenka Chidi Ibe nọ n’isi ya akatọọla mwakpo ndị soja Naịjiriya wakporo obodo dị iche iche na mpaghara Ọ̀lụ́, Imo Steeti.

N’ozi nke Onye Ndụmọdụ Mgbasa ozi ya, Kalụ Iduma tinyere aka, Ibe kwuru katọrọ etu ndị soja si hapụ ọrụ ha bịa na-etinye aka na idozi okwu gbasatara ọgbaghara dapụtara n’obodo, ebe ndị Uwe Ojii nọ ya.

“Anyị na-akpọku Onyeisiala Muhammadu Buharị ka ọ gbaa mbọ hụ na mkparịta ụka dị n’etiti ya na ndị IPOB maka na e mee nwata ka e mere ibe ya, obi adị ya mma.

“Gọvanọ Ụzọdịmma kwesịrị izere amamikpe n’oge ọdịnihu. Ihe ọbụla ọ na-eme taa iji weta udo na Steeti ya, o kwesịghị ịkpọbata ndị soja maka iweta udo n’ebe ọgbaghara dị ma ọ bụ maka òtù dị ka IPOB na-ekwu okwu nnwere onwe.

“Ihe Ndigbo ma bụ na ọbara ndị ọbụla ndị soja gbagburu n’Ọ̀lụ́ dị Gọvanọ Ụzọdịmma n’isi”.

Chetakwa na Gọvanọ Hope Ụzọdịmma n’onwe ya bụ onye Okpuru Ọchịchị Ọ̀lụ́, ebe nsogbu ahụ siri malite.

Kaọdịtaa, Ọkammụta Jọọjị Obiọzọ, Nnukwu Onyeisi òtù Ọhanaeze nke ndị Gọvanọ na – akwado enwebeghi ihe ọbụla o kwuru banyere mwakpo ndị soja wakporo mpaghara Ọ̀lụ́, n’agbanyeghị na obodo ya bụ Awọ-Ọmamma so n’ebe ọgbaghara ahụ metụtara.

A na-atụ anya na Ụlọikpe Abụja ga-etinye ọnụ n’akwụkwọ ndị òtù Chidi Ibe gbara ndị òtù Jọọjị Obiọzọ, n’ọnwa ọzọ, iji mara n’ime òtù abụọ ahụ ndị nke nhọpụta ha ziri ezi dịka iwuala Ọhanaeze siri dị.

Show More

Related Articles

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *

Back to top button
Close
Close