OBI CUBANA ABỤRỤWO ONYE EFCC NWỤCHIKORO



Abụja: Eze Oringo, Ichie Obi na Iyiegbu, onye a maara dịka Obi Cubana abụrụwo onye ụlọ ọrụ na – ahụ maka okwu banyere iri ngarị, EFCC nwụchikoro maka ibulu ego nakwa akwụghị ego ụtụ isi ziri ezi.
Obi Cubana wuchiri n’isi ụlọ ọrụ EFCC na Jabi Abụja mana ịgba ya ajụjụ ọnụ ka na-aga n’ihu rịọ ugbua.
Kemgbe nwaamadị mechara elimozu nne ya n’ọnwa Julaị n’obodo ya bụ Ọ̀bà, Anambara Steeti, ebe e gburu ehi karịrị narị abụọ ma na agha kwa ego ka a na-anwụnyụ anya, anya ụwa nile tinyere ndị EFCC bidoro sochiwe ya azụ.
Onu na – ekwuru ụlọ ọrụ EFCC gwara ndị nta akụkọ na ya enwetabeghi ozi banyere okwu ahụ.
Ọtụtụ ka tọrọ etu ya na ndị otu ya si eme ego ka ọ na o nweghịkwa ihe ego bụ, n’akwanyeghiri Naịra, ego ala Naịjiria ùgwù kwesịrị ekwesị. Nke a mesịrị na ọtụtụ ndị ntorobịa chọrọ ime ihe ọbụla iji “bute ike” dịka Cubana na ndị òtù ya.
Kaosiladị, ndị ọtụtụ ndị ọzọ hụtara ndị na-ata Cubana ụta maka etu o si aghafu ego ka mmiri dịka ndị “ọsụ imi” na ndị “obi akpọ”.
N’ezie, o nweghị onye Cubana dịnyere ohi ma ọ bụ ibu ọ́gwụ̀ ike ma ọ bụkwanụ ime yahoo. Ya bụ, ntorobịa Igbo, uche unu dị ya. “Ọ bụghị etu ihe nracha si ámị̀”
The EFCC spokesman, Wilson Uwujaren, said he has yet to be briefed on the development.