AKỤKỌ ỤWA
OBIGBO:NDỊ SOJA TIRI ONYE NTA AKỤKỌ VOA IHE, KPOCHIKWAA YA


Obigbo: Ndị soja Naịjiriya jidere Grace Alheri Abdu, onye nta akụkọ ụlọ mgbasa ozi mba Amerịka, Voice of America (VOA) ka ọ na – agba ndị mmadụ ajụjụ ọnụ ụbọchị Satọdee n’Obigbo, Rivas Steeti.
Akụkọ si n’aka akwụkwọ akụkọ Sahara Reporters na-ekwu na ha tiri ya ihe ma kpọchikwaa ya site n’elekere iri n’abụọ nke ehihie ha jidere ya were ruo n’abalị tupu ha atọhapụ ya.
Òtù Intersociety na Amnesty International etiela mkpu maka Nkwafu Ọbara ka na-aga n’ihu n’ebe ahụ.
A na-ebo ndị soja ebubo ịga n’ụlọ n’ụlọ na-egbu ndị mmadụ ndị ha boro ebubo ịbụ ndị òtù IPOB.
Kaosiladi, ndị isi soja Naịjiriya kwuru na nke ahụ abụghị eziokwu.