NKE NA-EME UGBUA

ỌCHỊAGHA ỤMAHỊ, RITUO N’ỌKWA! GỊ NA NWANNE GỊ JI NDỤ NDIGBO EGWU EGWU – ỌSTỊN OKEKE

Enugwu: Onye Nlekọta òtù Igbo Board of Deputies, Ọkaiwu Ọstịn Okeke ekwuola hoo!haa!! na Ọchịagha Obi Ụmahị, laworo ezumike nka bụ Onyeisi Oche ótù nchekwa nke ndị Gọvanọ Mpaghara Ọwụwa Anyanwụ Ndịda hiwere na nwanne ya nwoke, Gọvanọ Devidi Ụmahị nke Ebọnyị Steeti ejighi nchekwa Ala-Igbo kpọrọ ihe chaa chaa.

N’ozi o zigaara ndị nta akụkọ taa bụ ụbọchị Wenezdee, Ọkaiwu a ọdịmma Igbo na-anụ ọkụ n’obi kwuru sị :

“Kedụ ka nchekwa Ala-Igbo ga-esi dị n’aka ụmụnne abụọ?

“Gọvanọ Ụmahị bụ Onyeisi Oche Ọgbakọ ndị Gọvanọ Mpaghara Ọwụwa Anyanwụ Ndịda ebe nwanne ya nwoke tọrọ ya bụ Onyeisi Oche Kọmitii Nchekwa Mpaghara Ọwụwa Anyanwụ Ndịda.

“Mmadụ agwụla n’Ala-Igbo? Ọ bụ na o nweghịzị ndị ọzọ bụ ndị soja laworo ezumike nka n’Ala-Igbo? Anyị ga-achụtu Ọchịagha Ụmahị n’ọkwa ozigbo. Ụmụnne abụọ a ji ndụ Ndigbo egwu egwu n’anaghị atọ ọchị.”

Okeke kwara arịrị na ha abụọ akpọọla ekwo nkụ ma jụ ihiwe òtù nchekwa nke Mpaghara Ọwụwa Anyanwụ Ndịda Naịjiriya, na ha jụkwara imebe iwu machibidoro ịchịgharị na mpaghara ahụ ma jụkwa ịdọnyere òtù nchekwa Eastern Security Network (ESN) úkwù na mbọ ha na – agba maka nchekwaba ndụ n’akụnụba.

Cheta na òtù Ọhanaeze Veterans nọrọ n’izu ụka gara aga kpọkuo ndị “Okenye Amamihe Atọ” ka ha gbaa mbọ hụ na ndị IPOB (ndị hiwere ESN) na ndị Gọvanọ Ala-Igbo nwere ọgbakọ maka ihazighari ESN nakwa atụmatụ nchekwa Mpaghara Ọwụwa Anyanwụ Ndịda Naịjiriya.

Ndị okenye ahụ gụnyere Bishọọpụ Obi Ọnụbọgụ, Ọkammụta T. U. Nwala nakwa Ọkammụta Elo Amucheazi

Show More

Related Articles

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *

Back to top button
Close
Close