NKE NA-EME UGBUA

ỌGBAKỌ NDỊ GỌVANỌ IJI DOZI ESEMOKWU ỌHANAEZE AKPỤỌLA AFỌ N’ALA

Owere: Ozi hoo!haa!! nwetara na-egosi na ọgbakọ ndị Gọvanọ Mpaghara Ọwụwa Anyanwụ Ndịda kpọrọ n’Obi Gọọmenti Imo Steeti, Owere n’ehihie taa iji dozie esemokwu dị n’ótù Ọhanaeze Ndigbo kpụrụ afọ n’ala.

N’ọgbakọ ahụ, Onyeisi Oche ótù jikọrọ ndị Gọvanọ Mpaghara Ọwụwa Anyanwụ Ndịda ma bụrụkwa Aka na-achị Ebọnyị Steeti tinyere Sinetọ Hope Ụzọdịmma, Aka na-achị Imo Steeti nakwa òlé ọbịa bụ ndị Gọvanọ nọ n’ọgbakọ ahụ.

Nhọpụta Ọhaneze Ndigbo nke ikpeazụ e mere n’ọnwa gara aga butere ntiwa nakwa ndị nkwe na ndị ekweghị n’ime ótù ahụ bụ ótù kacha dị elu nke Ndigbo nwere.

N’akụkụ nke ndị kwenyere n’ọchịchị Ọkammụta Jọọjị Obiọzọ, ndị soro bịa ọgbakọ ahụ gụnyere Ọkammụta Jọọjị Obiọzọ (Onyeisi Izugbe), Ichie Gary Enwo-Ịgariwey.

N’akụkụ ndị nke Omenka Chidi Ibe, ndị so ya bịa gụnyere Ọkaiwu Uche Ọkwụkwụ (Osote Onyeisi Izugbe) na Mazị Okechukwu Isiguzoro (Odeakwụkwọ Ukwu).

Kepukepu hoo!haa!! nụrụ gosiri na ihe butere ọgbakọ ịkpa udo ahụ bụ na ndị ótù Omenka Chidi Ibe gara n’ihu na ịgbanye mgbọrọgwụ site na Njem ntụmadi ha gara n’obi Ọhanaeze Ndigbo n’Enugwu, ebe ha nọrọ kwuo na ha emechiela ụlọ ọrụ ahụ ruo mgbe Ichie Rochas Okorocha, Gọvanọ chịburu Imo Steeti, onye na-arụgharị ogige ahụ n’ụzọ pụrụ iche jiri rụtọpụ ya.

Ụlọ Mgbasa Ozi dị iche iche tinyere Channels TV na AIT buru ya bụ njem, nke buteere Gọvanọ Ụmahị na Gọvanọ Ụzọdịmma nnukwu mkparị ebe ha gwaworo Ụlọ ọrụ Onyeisiala nakwa ndị Gọvanọ ndị ọzọ na Naịjiriya na esemokwu ọbụla adịghị n’Ọhanaeze Ndigbo.

Ọzọkwa, ótù ndị okenye Ọhanaeze a kpọrọ Concerned Imeobi Members (CIM) nọrọ n’ọgbakọ ha nwere na Zoom na nso a were hiwe Kọmitii Nchere Oge nke ndị Bishọọpụ Ndigbo maka ime nhọpụta ọzọ, ebe ha kọwara nhọpụta Obiọzọ na nke Ibe dịka n’ezighi ezi maka na ha abụọ enweghị nke gbasoro Iwu ótù ahụ.

Kaosiladi, ya bụ ọgbakọ ịkpa udo kpụrụ afọ n’ala maka na Gọvanọ Ụmahị na Ụzọdịmma gwara Omenka Chidi Ibe na ndị ótù ya ka ha rituoro Ọkammụta Jọọjị Obiọzọ na ndị ótù ya.

Omenka Ibe, onye nke ga-adị afọ iri isii na nso a, jụrụ ajụ ma kwuo na ọ bụ Ọkammụta Obiọzọ ga-aritu ka ya mee ya Onyeisi Oche ndị Okenye(Elders’ Council).

Nchọpụta hoo!haa!! mere na-egosi na ọ bụ Gọvanọ Imo Steeti na nke Ebọnyị bu ihe banyere Ọkammụta Obiọzọ n’isi. Ndị Gọvanọ ụfọdụ dịka Wili Obianọ nke Anambara na Ifeanyi Ugwuanyi nke Enugwu Steeti nọ na-ele ha n’anya maka na ha ewerela nke ka ha mkpa bụ ọchịchị Ọhanaeze na Steeti ha.

N’aka nke ọzọ, ndị dị ka Gọvanọ Okọwa nke Delta na Gọvanọ Wike nke Rivas Steeti dịkwa nkwadebe ikwado Ibe, ma akpazie akpazie.

O nwebeghi ụbọchị ọzọ e tinyere ọgbakọ ịkpa udo ahụ.

Show More

Related Articles

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *

Back to top button
Close
Close