AKỤKỌ ỤWA

OGBUESHI EMA OKỌCHA, IKEMBA ASABA ANWỤỌLA

3 DAYS TO GO

Asaba: Ọdachi dakwasịrị Ndigbo ụnyahụ site na ọnwụ Ogbueshi Ema Okọcha, Ikemba Asaba.

Eze Ọdịnala ndị Asaba, Chike Edozien, Asagba n’Asaba chịrị ya Ikemba Asaba n’afọ gara aga iji nọchie Ọchịagha Igbo Ogbueshi Jo Achụzịa, Odogwu Agha Bịafra onye jibu ọkwa ahụ bụ echichi a na-echi ndị bụ dike.

Okọcha, onye dị ihe dịka afọ iri isii n’isii tupu laa mmụọ bụ onye ụwa maara dịka onye nta akụkọ nakwa odee.

Akwụkwọ e ji mara ya bụ nke ọ kpọrọ “Blood on the Niger” bụ akwụkwọ banyere Nkwafu Ọbara Asaba nke Ọchịagha Murtala Mohammed na ndị òtù ya mere n’Asaba n’oge agha Biafra, iji taa ndị Asaba ahụhụ maka ikwado ụmụnne ha – Ndigbo n’agha ahụ.

Okocha bụ onye Imeobi Ọhaneze Ndigbo, onye n’ejighi okwu banyere Ndigbo egwu egwu.

“Odogwu alaa!”

Show More

Related Articles

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *

Back to top button
Close
Close