NKE NA-EME UGBUA
OGBUGBU ONYE “VENDOR” :NDỊ UWE OJII ANỌCHIELA AREA 1 MAKA NGAGHARỊ IWE


Abụja : Ozi hoo!haa!! nwetara na-ekwu na ndị Uwe Ojii na ndị soja anọchiela akụkụ Area 1 n’Abụja iji gbochie ngagharị iwe ndị na-ere akwụkwọ akụkọ (vendors) chọburu ime n’ụtụtụ taa maka Ifeanyi Elekwachi, onye òtù ha Onye Uwe Ojii na-eso Ọnụ na-ekwuru Ụlọ Nzukọ Nta Naịjiriya, Rt. Hon. Femi Gbajabiamila gbagburu ụnyahụ n’akụkụ ogige Federal Secretariat, Abụja.