AKỤKỌ ỤWA

OGBUNIGWE MKPANAKA GBAWANAHỤRỤ ONYE UWE OJII, Ọ BỤGHỊ ONYE “SUICIDE BOMBER”

Afikpo: Ndị Uwe Ojii n’Ebọnyi Steeti ekwuola hoo!haa! na ọ bụ onye Uwe Ojii onye otu ha e zigara ọrụ pụrụ iche ka ogbunigwe mkpanaka (grenade) ya gbawanahụrụ n’Ehugbo dị n’Okpuru Ọchịchị Mgbago Ugwu Afikpo na steeti ahụ, na ọ bụghị onye “suicide bomber”.

Ogbunigwe mkpanaka ahụ gbagburu ótù nwoke n’etiti ụbọchị Tuuzdee n’akụkụ Ahịa Eke ndị obodo ahụ.


Ọnụ na-ekwuchuru ndị Uwe Ojii n’Ebọnyi Steeti, Lọveetị Odah kwuru na ọ bụ onye ótù ha ka ogbunigwe mkpanaka o tu n’úkwù gbawanahụrụ na ntụmadị.

“Ọ bụghị onye ‘suicide bomber’. Ọ bụ onye Uwe Ojii ojii aha ya bụ Inspector Idi Aminu ji ogbunigwe mkpanaka (hand grenade) anyị ji arụ ọrụ bụ ihe gbara na-amaghị ama.”

Ọda kwuru na ikpere aka onye Uwe Ojii ahụ laworo mmụọ kụtụrụ n’ebe ndọlite (pin) ya bụ ogbunigwe mkpanaka mere o ji gbawaa n’ike were gbuo ya.

Ọdachi ahụ dapụtara ebe ahụ taa dọtara igwe mmadụ ndị gbakọrọ ịbịa hụ ihe mere, ebe ọtụtụ ụlọọrụ nakwa ụlọ ahịa nọ n’akụkụ ebe ahụ mechiri maka ize ndụ.

Show More

Related Articles

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *

Back to top button
Close
Close