AKỤKỌ ỤWA

ỌGỤ AMOTEKUN NA NDI NCHI EHI FULANI N’AKURE: OTU ONYE AMOTEKUN E GBÙRÙ MMA KOROPURU

Akure – Ọgụ kpụ ọkụ n’ọnụ dapụtara n’izu ụka gara aga oge ndi ọrụ nchekwa Ala Yoroba bụ Amotekun, Ngalaba Steeti Ondo na ndi nchi ehi Fulani chịpụrụ ya na Sango, Igboba dị n’Akure bụ Isiobodo Steeti ahụ.

Ozi hoo!haa!! nwetara na-ekwu na ọgụ dapụtara oge ndi Amotekun chọrọ itinye n’ọrụ bụ iwu steeti ahụ nke machibidoro ịchịgharị ehi.

Ndi Amotekun ahụ gbatara ọsọ enyemaka maka oku ha nwetara site n’aka ndi ọrụ ugbo ndi nchi ehi ahụ chịrị ehi banye n’ugbo ha.

Ụfọdụ ndi Amotekun ahụ nwetara nnukwu mmerụahụ sitere na mma ndi nchi ehi ahụ gburu ha, ebe ọgụ ahụ mere ka ụgbọala nakwa ndị mmadụ kwụsị ịga n’okporoụzọ Akure – Ado ihe karịrị elekere abụọ.

N’okwu ya, Odeakwụkwọ ndi Ọrụ Nchekwa Amotekun na steeti ahụ, Jimoh Adeniken, kwuru na ndi ọrụ ha gosiri nnukwu nkwụdosi ike na ịka obi n’oge ahụ, iji hụ na nnukwu ọgbaghara adapụtaghị, n’agbanyeghi mwakpo awakporo ha.

“Ndi nwe ugbo du ndi Amotekun gaa n’ugbo ha. Ha hụrụ ehi karịrị otu narị na iri abụọ ebe ahụ, n’enweghi onye chị ha.

“Iji dewe iwu steeti a nke megidere ịchịgharị ehi nke steeti a, ndi Amotekun ahụ ji nwayọọ chụpụta ehi ndị ahụ n’ugbo ndị mmadụ.

“Kaosiladị, ka ha na-agafezi n’akụkụ Sango nke dị n’Igboba n’Akure, ndi Fulani ji ma égbè ma karama ma mma wakporo ha.

“Ndi ọrụ nchekwa anyị lara azụ site na ntimiwu ha nwetara n’aka ndi isi anyị na Steeti Ondo. Ndi Fulani sochiri ha, na-atụ ha ma okwute ma karama. Ótú onye Amotekun ha gbutere mma ka ha na-achọ ịnata ha égbè ha koropuru.

“N’usoro ndi ọrụ anyị gbálìrì égbè n’elu iji chụsasịa ha were laghachi n’ụlọ ọrụ anyị”

Hmmmmm, akụkọ a nwekwara ka ọ dị. Kedu ka ndi Amotekun ji égbè ga -esi nọrọ ndi Fulani ehi ha na-emebi ugbo ndi mmadụ e were mma chọọ igbunyu ha anya, ọ bụrụ site na ntimiwu ndi isi ha? Kedu udiri ntimiwu nzuzu bụ nke a?

Show More

Related Articles

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *

Back to top button
Close
Close