AKỤKỌ ỤWA
ỌGỤ NDỊ AṄỤRỤMA ATAALA ISI MMADỤ, N’ÀLỌ̀ IDEMILI


Ọ́KÁ: Ọdachi dapụtara n’Àlọ̀ dị n’Okpuru Ọchịchị Ndịda Idemili nke Anambara Steeti oge ótù nwaamadị, Ọsọndụ Okoye nwụnyụrụ anya ka ọgụ dara n’etiti ndị aṅụrụma ebe ahụ ụbọchị Sọnde.

Ótù onye akaebe, Eliza, onye nwere ụlọ ahịa n’akụkụ ebe ahụ kwuru na onye ahụ lawa mmụọ, na ya na ndị enyi ya nọ n’ọ́dụ̀ mmanya na ekpori ndụ. Na ntụmadị, nghọtahie dapụtara n’etiti ya na ótù enyi ya nwoke, Ugochukwu Ngige.
“Ụfọdụ ụmụ okorobịa nọ na – aṅụ mmanya n’ọ́dụ̀ mmanya n’Uruezeani, Àlọ̀ ka sị emebu na mbụ.
“Ọgụ dazịrị n’etiti mmadụ abụọ, Ọsọndụ Okoye na Ugochukwu Ngige. Ka Ọsọndụ dara n’ala, Ugochukwu zọwara ya ụkwụ n’obi.
“Ugochukwu gbalagara ka ọ hụrụ na Ọsọndụ na – ekubizi.”
Kaọdịtaa, ndị Uwe Ojii ka na eme nnyocha banyere okwu ahụ.