AKỤKỌ ỤWA
ỌGỤ NDỊ AWỤSA NA NDỊ YOROBA N’OGUN STEETI ATAWO ISI IHE KARỊRỊ MMADỤ ASAA



Abiokuta: Opekata mpe, mmadụ asaa nwụnyụru anya n’ọgụ dapụtara n’etiti ndị Awụsa na ndị Yoroba n’Ibese dị n’Okpuru Ọchịchị Mgbago Ugwu Yewa, Ogun Steeti ụbọchị Monde.
Ọgụ ahụ bidoro dịka nghọtahie dị n’etiti ndị ọkada ndị Awụsa na ndị na-anakọ ego ndị ótù (Union) n’ihu ụlọ ọrụ Dangote Sịmentị.
Ozi hoo!haa!! nwetara na – ekwu na ndị ótù buliri ego ha na – ana ndị ọkada kwa ụbọchị site na Narị Naira Isii gazịa Narị Naịra asatọ.
Kaosiladị, okwu ahụ gbasarazịrị,ghọrọ ọgụ ndị Awụsa na ndị Yoroba.
Ọnụ na-ekwuru ndị Uwe Ojii na steeti ahụ, Mazi Abimbola Oyeyemi, kọwara na ha enweghị ike ikwu mmadụ ole nwụnyụru anya n’ọgụ ahụ.