AKỤKỌ ỤWA
Ọ̀GỤ̀ NDỊ ỌKADA NA NDỊ AHỊA NDIGBO NA DEI DEI, ABỤJA: EGBUWO MMADỤ ISE, GBAKWAA ỤLỌ ỌKỤ



Abụja: Ihe ruru mmadụ ise anwụnyụọla anya, ebe a gbakwara ụlọ olemole ọkụ taa na Mpaghara Dei Dei, Abụja, oge ọgụ dapụtara n’etiti ndị ọkada ndị Awụsa na ndị ahịa Ndigbo.
Ótù onye bi ebe ahụ kwuru na nsogbu malitere oge onye ọkada kụgburu onye ahịa nke mere ndị ahịa ndị ótù ya jiri jide ya bụ onye ọkada ha sịrị kụgburu onye ahia ahụ maka etu o siri anya ọkada ọnwụ ọnwụ.
Ka ha na-akụzi ya ka ha kụgbuo, ndị ọkada ndị Awụsa ndị ọzọ zukọrọ bịa ọgụ.
E sunyekwara n’ụlọ Ndigbo n’ebe ahụ, ka ọgụ ahụ na – aga n’ihu.
Ka ọ dị ugbua, ndị uwe ojii awuchiela ebe ahụ iji kwụsị ọgụ ahụ tupu ọ ghọrọ agha n’etiti Ndigbo na ndị Awụsa.