AKỤKỌ ỤWA

ỌGỤ NDIGBO NA NDỊ AGBORO N’AHỊA LADIKPỌ, MMADỤ OLE NWỤRỤ?

Legọs: Ọgụ kpụ ọkụ n’ọnụ dapụtara n’uhuruchi ụbọchị Mọnde n’ahịa Akụkụ Ụgbọala, Ladịkpọ, Legọs n’etiti ndị agboro na Ndigbo na – azụ ahịa ebe ahụ.

Ụfọdụ ndị mmadụ na-ekwu na ndị tufuru ndụ ha n’ọgbaghara ahụ ruru mmadụ atọ.

Kaosiladi, Ọnụ na-ekwuru Ndị Uwe Ojii na Steeti ahụ, Olumuyiwa Adejobi kwuru na nke ahụ bụ asị, na o nweghị onye nwụrụ.

“O nweghị onye ọbụla nwụrụ. Ndị soja nke Ngalaba Nchekwa Operation Mesa gbatara n’oge bịa gboo ọgụ ahụ.

“Kọmishọna ndị Uwe ojii Legọs Steeti Hakeem Odumosu enyewo kwa ntụziaka ka e mee nnyocha banyere okwu ahụ”.

Ihe butere ọgụ ahụ bụ udiri nnukwu ego ndị agboro na-ana ndị keke ebe ahụ, nke mere ka ego ịgba keke rịzịa elu.

Show More

Related Articles

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *

Back to top button
Close
Close