Ọ́GWỤ̀ EGO: AKA AKPARALA NWATAKỊRỊ BINI GBURU NNE YA, DINAA ÓZÚ YA



Bini – Aka ndi Uweojii Naịjiriya Ngalaba Steeti Edo akparala, Samuel Akpobome nwokorọbịa dị afọ iri na asatọ, onye gburu nne mụrụ ya, ma dinaa ózú ya iji gwọọ ọ́gwụ̀ ego.
Ozi hoo!haa!! nwetara na-ekwu na o gburu nne ya n’isi ụtụtụ, n’abalị iri abụọ na itoolu nke ọnwa Ọktoba afọ 2023 na be ha dị n’Okporoụzọ Market Road,n’Ologbo nke nọ n’Okpuru Ọchịchị Ikpoba-Okha na steeti ahụ mana ọ bụzị n’ọnwa a bụ Julayị afọ 2024, ka a chọpụtara.
Akpobome, onye bụ ọ́dụ̀dụ̀ nwa, kwuru na ya tọgburu nne ya, Christiana Ighoyivwi, ka ọ nọ n’ụra site na ntuziaka ótú onye dibịa nọ n’Ọghara, Steeti Delta, onye gwara ya na igbu nne ya dinaa ya ga -eme ka o nwee ego.
“A tọgburu m nne m n’ebe elekere ise nke isi ụtụtụ ka ọ nọ n’ụra. Ótú onye dibịa n’Ọghara gwara na m mee ya na m ga-enwe ego.
“Ọ gwara ka m debe ózú ya na-edina ya mana ọ gwaghị m mkpụrụ ụbọchị ole m ga-eme nke ahụ. Nne m emeghị h ihe ọjọọ ọbụla, e gburu m ya maka ihi ego.
Nne nne ya hụzịrị ózú ahụ were tikuo ọhaneze ndi kpaara ya aka were ndi Uweojii ndi bịara kpụrụ ya.
Johnson Kokumo, Kọmishọọna ndi Uweojii na steeti ahụ nọrọ n’oge ọ kpụpụtara nwokorọbịa ahụ n’ekperime mmadụ iri asatọ ndị ọzọ kwere nkwa na a ga-eme nnyocha ziri ezi banyere okwu ahụ, iji kpụga ya ụlọikpe.
Tụfịakwa! Arụ!! Nwatakịrị igbu nne ya, dinaa ózú iji mee ọ́gwụ̀ ego? Bikonu, kedu ihe nwa afọ iri asatọ ji ego eme nke ịkpa udiri arụ a?