AKỤKỌ ỤWA
Ọ́GWỤ̀ EGO: NWOKE BAUCHI EBEELA MMADỤ ISI, GỤRỤ YA MKPỤRỤ ANYA


Bauchi: Ụlọ ọrụ Ndi Uwe Ojii na Bauchi Steeti anwuchikọọla Musa Hamza, onye dị afọ iri abụọ n’abụọ, onye beere isi Adamu Ibrahim, dị afọ iri n’asaa ma gụrụkwa mkpụrụ anya ya iji mee ọ́gwụ̀ ego.
Ọnụ na-ekwuru Ndị Uwe Ojii na Steeti ahụ, DSP Ahmed Mohammed Wakil, nọrọ n’ozi o wepụtara ụbọchị Mọnde were kwuo na. Dị Uwe Ojii si Ngalaba Ndị Uwe Ojii nọ na Alkaleri jidere Musa Hamza n’abalị iri abụọ n’otu nke ọnwa Disemba n’obodo nta Unguwar Wake di n’Okpuru Ọchịchị Alkaleri nke Steeti ahụ.
” Musa Hamza rabatara Adamu Ibrahim n’ime ọhịa, were osisi kụgbuo ya. O beere ya isi, gụrụ mkpụrụ anya ya ma kpọọ isi ya na ahụ ya ọkụ”
O kwuru na a ga-ewepụ okwu ahụ ụlọikpe ma ha mechaa nnyocha ha.
<