MMEMME

ỌHANAEZE NDIGBO SAWỤTỤ AFRỊKA EMEELA ỊGỤ ARỌ 2021

Ụbọchị Sọnde, abalị iri abụọ n’otu nke ọnwa Maachị, Ọhanaeze Ndigbo Sawụtụ Afrịka gbakọrọ n’obi Onowu Ndigbo na Sawụtụ Afrịka, Ezeali Ndụbụeze Udeji maka mmemme Ịgụ Arọ nke afọ a.

Ịgụ Arọ bụ mmemme Ndigbo ji anabata afọ (arọ) ọhụrụ site na ịgọ ọfọ na ikpe ekpere were kelee Chineke maka afọ gara aga ma rịọkwaa ngọzi na nchekwa ya n’afọ a.

Kaosiladi, mmachi sitere n’Ọria Koro kpatara n’emeghi nke afọ a ka o kpóó èkpò. Sọọsọ ndị bịara bụ ndị isi Ọhaneze Ndigbo na mba ahụ. Ụfọdụ n’ime ha gụnyere Mazị Douglas Sọnị-Wenike, Onyeisi Ọhaneze Ndigbo Sawụtụ Afrịka, Ichie Julius Ọsakwe, onye rịturu n’ọkwa dịka Onyeisi Ọhaneze Ndigbo Sawụtụ Afrịka, Ichie Amadi O. Amadi, Onye bụbu Onyeisi Ọhaneze Ndigbo Sawụtụ Afrịka na Ụkọchukwu Dọkịnta Ik Ụbawụchi.

Ndị ọzọ gụnyere Apostle Mike Maduabuchi Ugwu, Onyeisi Ótù ndị Enugwu Steeti na Sawụtụ Afrịka, Dọkịnta Fidelis Nwankwo, Onyeisi Ótù ndị Ebonyi Steeti na Sawụtụ Afrịka na Mazị Uchenna Ọnwụrolu, Onyeisi Ótù ndị Anambra Steeti na Sawụtụ Afrịka.

Dika onyeisi omenala Igbo na mba Sawụtụ Afrịka, Ezeali Ndụbụeze Udeji buru ụzọ tụọ nzu iji malite ya bụ mmemme. O nyekwara ndị isi Steeti asaa Ala-Igbo nakwa ndị Eze Ndigbo si Mpaghara itolu nke Sawụtụ Afrịka ji.

Ezeali Udeji jiri ohere ahụ were rịọ Chineke ka o nye Ndigbo ezigbo ndị ndu na ndị ọchịchị, ndị ga-eweta agamnihu n’Ala-Igbo.

Show More

Related Articles

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *

Back to top button
Close
Close