AKỤKỌ ỤWA

OHI ỌKỤKỌ: APỊAWO NWOKE KADUNA ÚBÉ ỤTARỊ IRI SITE NA MKPEBI ỤLỌIKPE

Kaduna – Ụlọikpe Majie Kaduna Steeti anọrọwo ụbọchị Wenezdee nye ntụziaka ka a pịa ótù nwaamadị aha ya bụ Adamu Isah‎ úbé ụtarị iri maka izu ohi ọkụkọ iri.

Ka o kwetara na ikpe mara ya, ma rịọkwaa mgbaghara, Majie Ibrahim Ịmanụwel dọrọ ya aka na ntị ka ọ gbanwee ndụ ya sepu aka na ime mpụ́.

Na mbụ, onye Uwe ojii wetara okwu ahụ, Chidi Leo gwara ụlọikpe ahụ na onye nwe ụlọ ọzụzụ ọkụkọ ahụ, Sani Rabiu wetara mkpesa banyere okwu ahụ n’ụlọ ndị Uwe Ojii dị na Gabasawa n’abalị iri na atọ nke ọnwa Mee.

O kwukwara na e nwudoro nwoke ahụ ka o bu ọkụkọ ndị ahụ n’akpa na-achọ ịgbalaga.

Hmmmm, nsogbu ụwa! Ya bụ ótù úbé ụtarị maka ótù ọkụkọ

Show More

Related Articles

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *

Back to top button
Close
Close