AKỤKỌ ỤWAUncategorized

ỌKỤ ADỌGBUWO MMADỤ ATỌ, TINYERE NNE NA NWA, N’AHỊA MOWE, STEETI OGUN

Abiokuta – Ọkụ latriki adọgbuwo mmadụ atọ, tinyere otu nwaanyị, Oriakụ Ujunwa Okeke, na nwa ya nwoke, n’ahịa Mowe dị n’Okpuru Ọchịchị Obafemi Owode na Steeti Ogun.

Njinji ahụ jiri ụbọchị Mọnde, ka e wetara ọkụ e weere oge oke mmiri zoro ụbọchị ụka.

Onyeisioche Okpuru Ọchịchị ahụ, Onye nnọchiteanya Adesina Ogunsola nọrọ ụbọchị Wenezdee oge ọ wuchiri n’ahia ahụ were nye ndi nile nọ n’okpuru ụdọ ọkụ ógó di elu (high tension) were azụ ahịa abalị asaa ka ha si ebe ahụ kwapụ, iji hụ na ‘ọzọ agaghịkwa eme’

O kwukwara na ọkụ ahụ gbariri nwaanyị ahụ na nwa ya nwoke agbari, nke na ihe fọdụrụ bụzị ọkpụkpọ ha repịara erepịa.

Onye akaebe nọ oge ihe ahụ mere kwuru na nsogbu ahụ sitere n’ígwè ọkụ (transformer) nọ n’elu ókpòrò ọkụ (pole) nke didebere ụlọ ahịa ebe njinji ahụ jiri.

Kaosiladị, ọnụ na-ekwuru ndi Uwe Ojii, Omolola Odutola, kwuru na ọ bụ sọọsọ Oriakụ Okeke bụ ihe nwụrụ n’ọdachi ahụ.

Show More

Related Articles

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *

Back to top button
Close
Close