Uncategorized
ỌKỤ AGBAGBUWO ỤMỤAKA BAUCHI ABỤỌ DỊ AFỌ ISE NA AFỌ ASAA BỤ ỤMỤNNE



Bauchi – Njinji nọrọ n’ụtụtụ ụbọchị ụka were jie na mpaghara Madina na Bauchi oge ọkụ ọgbụgba gbagburu obere ụmụaka abụọ bụ ụmụnne; Zainab Bashir Muhammad, dị afọ ise na Ummu Salma Bashir, dị afọ asaa.
Ndi akaebe na-ekwu na ọkụ ọgbụgba ahụ bidoro n’ebe elekere iri na otu nke ụtụtụ ụbọchị ụka, oge nne ha kpochidoro ha n’ụlọ na be ha didebere ụlọ akwụkwọ Praịmarị Barden Gabas, were gawa ịzụta ihe n’ahịa .
Otu onye agbataobi kwuru sị,”Oge anyi hụrụ ọkụ ahụ anyị gbagara ebe ahụ mana mbọ nile anyị gbara ịgbaka ọnụ ụzọ ámá ụlọ ahụ enweghị isi.

“Oge anyi ji nweta ngwaọrụ ndi kapịnta iji kpakaa ụzọ were banye, ọkụ agbagbuwo ụmụaka abụọ ahụ”
Chai! Ka mkpụrụ obi ha zuru ike na ndokwa. Ise!