ỌKỤ ENU ZARI HASSAN: Ọ MAKA YA KA NWUNYE RUDEBOY JI AGBA YA ALỤKWAGHỊM?



Na Oriakụ Anita Okoye (aha nna ya bụ Isama) edepuwo akwụkwọ ịgba di ya, Paul ‘Rudeboy’ Okoye alụkwaghịm abụghịzị akụkọ.
Ihe bụzị akụkọ bụ na ọ bụ nwanyị, Zari H tisara alụmdi na nwunye ha, dịworo afọ asaa tinyekwara ụmụ atọ Chineke jiri gọzie ha.
Zari bụ ọkụ enu, nwa-afọ Yuganda bi na Sawụtụ Afrịka, onye ji ụmụ nwoke obi mere aka ọrụ.
N’ọnwa Eprel, afọ 2019 di Zari, Diamond Platnumz, onyenwe Wasafi Records chụlara ya ka o bochara ya ebubo na ya na Rudeboy na – eme enyi.
Kaosiladi, Rudeboy gọrọ aka akara na ụkwụ ya, na ọ bụghị ya na Zari yịrị. Na ọ bụ Zari na ejima ya, Mr. P.
Anita akpọghị okwu aha na ya bụ akwụkwọ alụkwaghịm o dere mana ọ kọwara na ọ bụ maka nghọtahie n’ekweghị mkpezi.
Lezienụ anya, osisi kpọrọ nkụ ka a na-ele anya ọdịda, nke dị ndụ si n’úkwù foro. Rudeboy katọrọ nwanne ya, Mr. P maka ịlụ nwanyị Yoroba tọrọ ya atọ mana ha ka nọ, Rudeboy na nwunye ya gbasaa.