ỌKỤ GBARA AHỊA ALABA: ANYỊ KPACHARA TINYE YA – NDỊ UWE OJII


Legọs – Ndi Uwe Ojii ekwuola na ọ bụ ha tinyere ọkụ n’ahịa mbaụwa “Alaba International”, Legọs ụbọchị Fraịdee.
N’okwu ọ gwara ndị nta akụkọ, Ọnụ na-ekwuru Ndị Uwe Ojii na steeti ahụ, SP Benjamin Hundeyin kwuru hoo!haa! na ọ bụ Uwe Ojii si na Ngalaba ndị Uwe Ojii nke Ọjọ tinyere ọkụ ahụ.
Kaosiladi, ọ sịrị na ha etinye ọkụ n’ahịa ahụ, na ha sunyere ọkụ na nkịrịka ụlọ osisi dịdebere ahịa ahụ, ebe ndị omekome bi.
Hundeyin kwuru sị, “Ikwu na ọkụ gbara ahịa Alaba bụ okwu asị. Site n’ozi ndị ọrụ anyị nwetara banyere ndị omekome bi ebe ahụ, ha wakporo nkịrịka ụlọ osisi dịdebere ahịa ahụ ebe nwụchikọrọ ụfọdụ ndị omekome ma nakọrọkwa ha égbè ha. Ndị Uwe Ojii ndị ahụ si na Ngalaba ndị Uwe ojii nke Ọjọ sunyeziri ọkụ na nkịrịka ụlọ osisi ndị ahụ”
Nke bụ eziokwu bụ na ọkụ gbara ahịa Alaba International ụbọchị Fraịdee were repịa ngwaahịa ọnụ ahịa ya karịrị nde pụrụ nde Naira.
N’okwu ya, Oriakụ Margaret Adeseye, Onye Nlekọta Ụlọ ọrụ Lagos State Fire and Rescue Services kwuru na ìgwè mmadụ iwe ji ekweghị ka ndị ọrụ ntinyụ ọkụ rụọ ọrụ ha ebe ahụ.
Ọ kọwara na ndị Ụlọ ọrụ na ndị ọrụ nchekwa obodo jikọrọ aka ọnụ ịmara etu a ga-esi kwọọ onye úkwù wara.