OKWU NKWAPỤ N’ỤLỌ: AKA AKPARALA NWAANYỊ OVOKO JI AKAÓDÓ PỊAWAA ONYE-NWE-ỤLỌ ISI



Nsụka – Aka akparala nwaanyị jiri akaodo pịawaa onyenweụlọ isi n’Ụmụgbabe, Ovoko dị n’Okpuru Ọchịchị Ndịda Igbo-Eze, Steeti Enugwu maka ịgwa ya kwapụ n’ụlọ ya.
Site n’ozi onye mgbasaozi, Chijinkem Ugwuanyi, gbasara na Facebook n’ụbọchị Fraịdee, abalị iri atọ n’otu nke ọnwa Jenuwarị, nwaanyị a na ụmụ ya abụọ wakporo ya bụ onye-nwe-ụlọ, bụ nwa ólú (onye nne na nna ya anọghịzị) maka na ọ gwara ha kwapụ n’ụlọ
“Nwaanyị ahụ jiri akaódó pịawaa ya isi maka na ọ sị ha kwapụ n’ụlọ ya dị n’Umugbabe Ovoko dị n’Okpuru Ọchịchị Ndịda Igbo-Eze na Steeti Enugwu. Ya bụ ájábárá nwaanyị na ụmụ ya abụọ ka a kpọchiri ugbua n’ụlọ ọrụ ndi Uweojii n’Ibagawa Aka.
“Nwokorọbịa ahụ bụ onye-nwe-ụlọ hapụburu nwaanyị ahụ ka o biri ebe ahụ maka na ụlọ ahụ ebuka sọọsọ ya ibi na ya”
Hmmmmm! Nsogbu ụwa, ọgọ m egbula m