ỌNWỤ EGBUOLA OSOTE NNUKWU ONYEISIOCHE LABOUR PARTY, LP



Ọnwụ egbuola Osote Nnukwu Onyeisioche òtù ndọrọndọrọ ọchịchị Labour Party, LP, Mpaghara Ugwu Obinetiti (North Central), Comrade Adi Shirsha Adi, onye nwụrụ ka ọ rịara ahụ obere oge.
Ozi sitere n’aka Ode Akwụkwọ Mgbasa ozi LP Comrade Abayomi Arabambi, nke o dere n’aha Nnukwu Onyeisioche òtù ndọrọndọrọ ọchịchị ahụ, Julius Abure kwuru na ya bụ nwaamadị onye nwụrụ ụbọchị Wenezdee gbara afọ iri isii na otu tupu ọ laa mụọ.

Adi bụ onye Okpuru Ọchịchị Konshisha nke dị na Benuwe Steeti.
Ozi ahụ kwukwara sị: “Òtù ndọrọndọrọ ọchịchị anyị ji mwute ekwupụta ọnwụ Comrade Adi Shirsha Adi, onye nke gbara mbọ nke ukwuu ime ka LP bawanye na mpaghara ya.
“Anyị na-arịọzị ezinụlọ ya ka ha nwee nkasi obi. Dịka ka ndị kwenyere na Chineke, sọọsọ ihe dịịrị anyị bụ inye Chineke ekele maka ndụ. Dịka òtù ndọrọndọrọ ọchịchị anyị ga-agbakwa mbọ ịkwụdosi ike ma gakwaa n’ihu n’ezi nkwenye ndị ahụ o nwere”