ONYE AṄỤRỤMA ABAKPA ETIGBUOLA NWUNYE YA DỊ IME


Enugwu: Aka ndị Uwe Ojii akparala ótù nwoke onye aṅụrụma aha ya bụ Eke Nwe Ọfịa, onye tigidere nwunye ya dị ime ọnwa asatọ tigbunyụọ ya anya na Mpaghara Abakpa Nike, Enugwu.
Akụkọ ndị hụrụ ihe mere na-akọwa na ya bụ nwoke gachara ọrụ were lọta na be ya n’Okporo ụzọ Uburu-Ekwe n’Ogwuagọ, Abakpa Nike. Oge ọ jụrụ nwunye ya, Mama Goodluck maka nri, nwanyị ahụ gwara ya na nri adịghị, ebe o nweghị ego o wetara, na ọ bụ ndị agbata obi ka ọ rịọtara garị ụmụ ụmụ ha riri.
Nke a were nwoke ahụ iwe, o jiri malite ịkụ nwanyị ahụ ji ụmụ anọ “ihe tinker kụrụ pan”
Ka ume koropuru nwanyị ahụ, e bugara ụlọ ọgwụ ebe ọ nọrọ kubie.
Ndị nche ógbè kpụrụzịrị nwoke ahụ kpụgara ndị Uwe Ojii.
The mother of 4 who hails from Ebonyi State was pummelled by her husband Wednesday night and was rushed to a nearby hospital where she was confirmed dead.
The man was arrested by men of Ugwuagor Vigilante.
Hon. Ikechukwu Ukwuani, onye nlekọta ndị nche ógbè n’ebe ahụ kwuru na n’ezie na ha enyefeela nwoke ahụ n’aka ndị Uwe ojii.