Uncategorized

ONYE AṄỤRỤMA ONDO EJIRILA ỤGBỌALA KỤGBUO NWA AHỊA MBUGHARỊ

Akure – Nwoke onye aṅụrụma ejiriwo ụgbọala ya were kụgbuo Bassey Edet, nwatakịrị nwoke onye ahịa mbugharị, na-ere achịcha kpọf kpọf,oge ụgbọala ya, Toyota Picnic akara ndebanye aha ya bụ EPE 576DC gbakpuru n’ọ́dụ̀ ụgbọala dị n’Odogbolu, Ondo Steeti.

Ndị nọ oge Njinji ahụ jiri ụbọchị Satọdee kwuru na nwoke ahụ jiri mmanya ṅụsachaa isi tupu o buru ụgbọala pụta n’okporo ụzọ; na ahụ ya nile na -esi mmanya mmanya.

Ọnụ na-ekwuru Ndị Uwe Ojii n’Ondo Steeti, Funmilayo Odunlami, kwuru na nwaamadị onye aṅụrụma ahụ nọzị n’aka ndị Uwe ojii ebe ime nnyocha na -aga n’ihu n’okwu ahụ.

O kwukwara na e bugala ozu nwata nwoke ahụ n’ọba ozu dị n’Òrè.

Chai! Nsogbu ụwa!

Show More

Related Articles

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *

Back to top button
Close
Close