AKỤKỌ ỤWA

ONYE COUNCILOR NDỊ FULANI GBARA ÉGBÈ NA WỌRỊ ANWỤWO

Wọrị: Jude Adjekpogu, Councilor na-anọchite anya Mpaghara nke ise n’Okpuru Ọchịchị Ọwụwa Anyanwụ Ethiope na Delta Steeti, onye ndị Fulani gbara égbè abalị iri na atọ gara aga.

Onyeisi Oche Okpuru Ọchịchị ahụ, Viktọ Ofobrukueta gwara ndị nta akụkọ na ya bụ nwaamadị nwụrụ ka a wachara ya ahụ ugboro abụọ.

“A wara ya ahụ ugboro abụọ maka na ndị ahụ gbatara ya égbè n’ọkpụkpụ azụ, àkùrù nakwa mgbị́rị́ afọ”

O kwukwara na a ga – ama ihe e mere ndị omekome na akpa mkpa mkpa n’ebe ahụ.

A gbara Adjekpogu égbè ụbọchị Satọdee, abalị isii nke ọnwa Disemba afọ a n’Okporo Ụzọ Eku – Abraka, oge ọ gachara mmemme na – ala be ya.

E nwetanwughi DSP Bright Edafe, Ọnụ na – ekwuru Ndị Uwe Ojii na steeti ahụ n’ekwentị maka uche obi ya tupu akụkọ a apụọ.

Show More

Related Articles

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *

Back to top button
Close
Close